Zekaraia 10:7-12 Bible Nso (IGBOB)

7. Ndi Efraim gādi kwa ka dike, obi-ha gāṅuri kwa ọṅu dika site na manya-vine: e, umu-ha gāhu ya, we ṅuria; obi-ha gēteghari egwú ọṅù nime Jehova.

8. M'gākpọkọta kwa ha òkù, chikọta ha; n'ihi na ab͕aputawom ha: ha gāba kwa uba otú ha baworo uba.

9. M'gāgha kwa ha dika nkpuru n'etiti ndi nile di iche iche; ọ bu kwa n'ebe nile di anya ka ha gēchetam: ha gādi kwa ndu, ha na umu-ha, we lata.

10. M'gēme kwa ka ha si n'ala Ijipt lata, ọ bu kwa n'Asiria ka M'gāchikọputa ha; ọ bu kwa ala Gilead na Lebanon ka M'gēme ka ha bata; agaghi-ahu-kwa-ra ha ọnọdu.

11. Ọ gāgabiga kwa n'oké osimiri nke nkpab͕u, tie oké osimiri nke ọtutu nmali-miri, ebe di omimi nile nke Nail gātakọrọ kwa: agēbuda kwa npako Asiria n'ala, nkpa-n'aka Ijipt gēwezuga kwa onwe-ya.

12. M'gēme kwa ka ha di ike nime Jehova; ọ bu kwa n'aha-Ya ka ha ganējeghari; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Zekaraia 10