13. Were inu-ọku-n'obi dupu Zinas onye-iwu na Apọlos n'ije-ha, ka ihe ọ bula ghara ifọdu nke ha nēnweghi.
14. Ka ndi-ayi muta kwa ibu ndi-isi n'ọlu ọma ib͕o nkpà nākpa umu-nna-ayi, ka ha ghara ibu ndi nāmighi nkpuru.
15. Ndi nile mu na ha nọ nēkele gi. Kele ndi huru ayi n'anya n'okwukwe.Ka amara dinyere unu nile.