12. ka ulo-gi di kwa ka ulo Perez, onye Tema muru nye Juda, site na nkpuru nke Jehova g=enye gi site na nwa-ab͕ọghọ a.
13. Boaz we kuru Rut, o we ghọrọ ya nwunye; o we bakuru ya, Jehova we me ka ọ turu ime, ọ mua nwa-nwoke.
14. Ndinyom we si Naomi, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye n=emeghi ka onye-nb͕aputa kwusiri gi ta, ka akpọ kwa aha-ya n>Israel.
15. _O g=abu-kwa-ra gi onye n=enyeghachi ndu, na onye g=az#u gi n>isi-awọ: n>ihi na nwunye nwa-gi, nke huru gi n>anya, nke diri gi nma kari umu-ndikom asa, amuwo ya.
16. Naomi we kuru nwata ahu, tukwasi ya n>obi-ya, ghọrọ ya onye n=az#u nwa.