1. Jehova we si Moses, Bakuru Fero, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.
2. N'ihi na, ma ọ buru na gi onwe-gi nāju izipu ha, ma i nējigide ha,
3. le, aka Jehova di n'aru anu-ulo-gi nke di n'ọhia, n'aru inyinya-gi nile, na n'aru inyinya-ibu-gi nile, na n'aru camel-gi nile, na n'aru ìgwè ehi-gi, na n'aru ìgwè ewu na aturu-gi: ajọ ọria nke nēfe efe, nke di arọ́ nke-uku, gādi.
4. Jehova gākpa ókè n'etiti anu-ulo Israel na anu-ulo Ijipt: ọ dighi ihe gānwupu n'ihe nile umu Israel nwere.
5. Jehova we debe mb͕e akara àkà, si, Echi ka Jehova gēme ihe a n'ala nka.
6. Jehova we me ihe ahu n'echi-ya, anu-ulo Ijipt nile we nwua: ma nime anu-ulo umu Israel ọ dighi otù nwupuru.
7. Fero we ziga, ma, le, ọ dighi ma ọbuná otù nwupuru nime anu-ulo Israel. Obi Fero we di arọ́, o zipughi kwa ndi Israel.
8. Jehova we si Moses na Eron, Kporonu n'onwe-unu ntu oké ọku nju aka abua, ka Moses wu kwa ya n'iru elu-igwe n'anya Fero.
9. Ọ gāghọ uzuzu ntà n'elu ala Ijipt nile, ọ gāghọ kwa etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu, n'ala Ijipt nile.
10. Ha we kporo ntu oké ọku, guzo n'iru Fero; Moses we wua ya n'iru elu-igwe; o we ghọ ihe etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu.
11. Ndi-ode-akwukwọ di nsọ apughi kwa iguzo n'iru Moses, n'ihi ihe-ofifi ahu; n'ihi na ihe-etuto ahu di n'aru ndi-ode-akwukwọ di nsọ, na n'aru ndi Ijipt nile.
12. Jehova we me ka obi Fero di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova gwara Moses.