Ọpupu 8:25-31 Bible Nso (IGBOB)

25. Fero we kpọ Moses na Eron, si, Jenu, chuara Chineke-unu àjà n'ala nka.

26. Moses we si, O kwesighi ime otú a; n'ihi na ihe-árú ndi Ijipt ka ayi gēji chuara Jehova, bú Chineke-ayi, aja: le, àyi gēwere ihe-árú ndi Ijipt chu àjà n'anya-ha, ha agaghi-atub͕u kwa ayi na nkume?

27. Ije nke ubọchi atọ ka ayi gēje n'ọzara, chu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-ayi, àjà, dika Ọ nāsi ayi me.

28. Fero we si, Mu onwem gēzipu unu, ka unu we chuara Jehova, bú Chineke-unu, àjà n'ọzara; ọ bu nání na unu agaghi-eje ebe di anya nke-uku: riọrọnum aririọ.

29. Moses we si, Le, Mu onwem nēsi n'ebe i nọ pua, m'gāriọ kwa Jehova ka odudu we wezuga onwe-ha n'ebe Fero nọ, na n'ebe ndi-orù-ya nọ, na n'ebe ndi-ya nọ, echi: ma ka Fero ghara ikwa emò ọzọ, n'ighara izipu ndi Israel ichuru Jehova àjà.

30. Moses we si n'ebe Fero nọ pua, we riọ Jehova.

31. Jehova we me dika okwu Moses si di; O we wezuga odudu n'ebe Fero nọ, na n'ebe ndi-orù-ya nọ, na n'ebe ndi-ya nọ; ọ dighi otù fọduru.

Ọpupu 8