1. Jehova we si Moses, Bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.
2. Ma o buru na gi onwe-gi aju izipu ha, le, Mu onwem gaje iwere awọ tie ókè-ala-gi nile:
3. osimiri Nail gēnuputa awọ, nke gārigo ba n'ulo-gi, na n'ime-ulo-ndina-gi, na n'elu ihe-ndina-gi, na n'ulo ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi, na n'ite-ọku-gi nile, na n'ihe-gi i ji agwọ achicha:
4. ọ bu kwa n'aru gi, na n'aru ndi-gi, na n'aru ndi-orù-gi nile, ka awọ ahu gārigo.
5. Jehova we si Moses, Si Eron, Setipu aka-gi, ya na nkpa-n'aka-gi, n'elu osimiri nile, na n'elu osimiri Nail nile, na n'elu ọdọ-miri nile, me ka awọ rigota n'ala Ijipt.
6. Eron we setipu aka-ya n'elu miri nile nke Ijipt; awọ we rigo, kpuchie ala Ijipt.
7. Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, we me ka awọ rigo n'elu ala Ijipt.