Ọpupu 40:34-38 Bible Nso (IGBOB)

34. Igwe-oji ahu we kpuchie ulo-ikwū nzute, ebube Jehova we juputa ebe-obibi ahu.

35. Moses apughi kwa ibà n'ulo-ikwū nzute, n'ihi na igwe-oji ahu biri n'elu ya, ebube Jehova juputa-kwa-ra ebe-obibi ahu.

36. Mb͕e ọ bula emere ka igwe-oji ahu si n'elu ebe-obibi ahu rigo, umu Israel we bulie ije, nime nbuli-ije-ha nile:

37. ma ọ buru na emeghi ka igwe-oji ahu rigo, ha adighi-ebuli kwa ije rue ubọchi emere ka ọ rigo.

38. N'ihi na igwe-oji nke Jehova di n'elu ebe-obibi ahu n'ehihie, ọku di kwa nime ya n'abali, n'anya ulo Israel nile, nime nbuli-ije-ha nile.

Ọpupu 40