30. Ọ dọba ite ọsisa-miri ahu n'etiti ulo-ikwū nzute na ebe-ichu-àjà, tiye miri n'ebe ahu, iji sa aru.
31. Moses na Eron na umu-ya ndikom we sa aka-ha na ukwu-ha site na ya:
32. mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, na mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso, ha we sa aru: dika Jehova nyere Moses iwu.
33. O guzo-kwa-ra ogige ahu ọtọ buru-buru ebe-obibi ahu na ebe-ichu-àjà ahu, tiye ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu. Moses we jesia ozi ahu.
34. Igwe-oji ahu we kpuchie ulo-ikwū nzute, ebube Jehova we juputa ebe-obibi ahu.
35. Moses apughi kwa ibà n'ulo-ikwū nzute, n'ihi na igwe-oji ahu biri n'elu ya, ebube Jehova juputa-kwa-ra ebe-obibi ahu.