10. O me-kwa-ra table osisi acacia ahu: cubit abua ka ogologo-ya di, otù cubit ka obosara-ya di, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya di:
11. ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, me-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu.
12. O me-kwa-ra ya ihe-njìkọ buruburu nke ra ka otù ọbu-aka, mere ihe-njikọ-ya mpempe ọla-edo buruburu.
13. Ọ wuara ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tukwasi nb͕a-aka ahu na nkuku anọ nke di n'ukwu anọ ya.
14. Na nso ihe-njikọ ahu ka nb͕a-aka di, ka ha buru ọnọdu itiye nkpa-n'aka eji ebu table ahu.