Ọpupu 37:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Bezalel me-kwa-ra ib͕e osisi acacia: cubit abua na nkera ka ogologo-ya di, otù cubit na nkera ka obosara-ya di kwa, otù cubit na nkera ka elu-ya di kwa:

2. ọ machita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, nime na azu ka ọ machitara ya, o we mere ya mpempe ọla-edo buruburu

3. O we wuara ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, n'ukwu anọ ya; bú nb͕a-aka abua n'otù akuku-ya, na nb͕a-aka abua n'akuku-ya ọzọ.

Ọpupu 37