Ọpupu 36:8-23 Bible Nso (IGBOB)

8. Onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe n'etiti ndi nēje ozi ahu we me ebe-obibi ahu: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu nke onye-ọ̀kà, ihe ndia ka o ji me ha.

9. Ogologo nke otù ákwà-nkwuba di orú cubit na asatọ, obosara nke otù ákwà-nkwuba di kwa cubit anọ: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba nile nwere.

10. O we jikọta ákwà-nkwuba ise, otù na ibe-ya: jikọta kwa ákwà-nkwuba ise nke-ọzọ, otù na ibe-ya.

11. O ji kwa ogho anunu me anya-nko n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba, site na nsọtu-ya nime njikọta ahu: otú a ka ọ me-kwa-ra n'ọnu-ọnu ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua.

12. Ọgu anya-nko abua na iri ka o mere n'otù ákwà-nkwuba, ọgu anya-nko abua na iri ka ọ me-kwa-ra nime nsọtu nke ákwà-nkwuba nke di na njikọta nke-abua: anya-nko cheritara onwe-ha iru, otù na ibe-ya.

13. O me-kwa-ra ọgu nko ọla-edo abua na iri, were nko ahu jikọta ákwà-nkwuba, otù na ibe-ya: ebe-obibi ahu we buru otù.

14. O me-kwa-ra ákwà-nkwuba aji ewu, ibu ulo-ikwū n'elu ebe-obibi ahu: ákwà-nkwuba iri na otù ka o mere ha.

15. Ogologo nke otù ákwà-nkwuba di orú cubit na iri, cubit anọ ka obosara nke otù ákwà-nkwuba di kwa: otù ọtùtù ka ákwà-nkwuba iri na otù ahu nwere.

16. O jikọta-kwa-ra ákwà-nkwuba ise iche, na ákwà-nkwuba isi iche.

17. O me-kwa-ra ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba ahu dipuru adipu nime njikọta ahu, ọ me-kwa-ra ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke-abua.

18. O me-kwa-ra ọgu nko ọla abua na iri, ijikọta ulo-ikwū ahu ka ọ we buru otù.

19. O were mere ulo-ikwū ahu ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, ya na ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya.

20. O we mere ebe-obibi ahu ibo osisi acacia, nke nēguzo ọtọ.

21. Cubit iri ka ogologo nke otù ibo di, otù cubit na nkera cubit ka obosara nke otù ibo di kwa.

22. Otù ibo nwere ihe-nhiọye abua, nke ekwukọtara, otù na ibe-ya: otú a ka o mere nye ibo nile nke ebe-obibi ahu.

23. O we mere ebe-obibi ahu ibo ahu; orú ibo ka ọ mere nye akuku Ndida chere iru na Ndida:

Ọpupu 36