Ọpupu 36:22-28 Bible Nso (IGBOB)

22. Otù ibo nwere ihe-nhiọye abua, nke ekwukọtara, otù na ibe-ya: otú a ka o mere nye ibo nile nke ebe-obibi ahu.

23. O we mere ebe-obibi ahu ibo ahu; orú ibo ka ọ mere nye akuku Ndida chere iru na Ndida:

24. ọgu ukwu ọla-ọcha abua ka o me-kwa-ra n'okpuru orú ibo ahu; ukwu abua n'okpuru otù ibo inara ihe-nhiọye-ya abua, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ inara ihe-nhiọye-ya abua.

25. O we mere akuku nke-abua nke ebe-obibi ahu orú ibo, bú akuku Ugwu,

26. na ọgu ukwu ọla-ọcha ha abua; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.

27. Isi ebe-obibi ahu nke chere iru n'Ọdida-anyanwu ka o me-kwa-ra ibo isi nye.

28. Ibo abua ka o me-kwa-ra nye nkuku ebe-obibi ahu n'isi-ya.

Ọpupu 36