Ọpupu 32:8-15 Bible Nso (IGBOB)

8. ha esiwo n'uzọ nke M'nyere ha n'iwu wezuga onwe-ha ngwa ngwa: ha eme-woro onwe-ha nwa-ehi akpuru akpu, ha we kpọ isi ala nye ya, chu-kwa-ra ya àjà, si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.

9. Jehova si-kwa-ra Moses, Ahuwom ndi nka, ma, le, ndi kwesiri olu ike ka ọ bu:

10. ma ub͕u a kwe ka M'nọduru Onwem, ka iwem we di ọku megide ha, ka M'we me kwa ka ha gwusia; M'gēme kwa gi ka i buru mba uku.

11. Moses we chọ ime ka iwe Jehova, bú Chineke-ya, dajua, ọ si, Jehova, n'ìhi gini ka iwe-Gi di ọku megide ndi-Gi, nke I meworo ka ha si n'ala Ijipt puta n'ike uku na n'aka di ike?

12. N'ìhi gini ka ndi Ijipt ganēkwu, si, Ọ bu ime ha ihe ọjọ ka O mere ka ha pua, ib͕u ha n'ugwu, na ime ka ha si n'elu uwa gwusia? Si n'idi-ọku nke iwe-Gi chigharia, chegharia n'ihe ọjọ a I nēchè imegide ndi-Gi.

13. Cheta Abraham, na Aisak, na Israel, bú ndi-orù-Gi, ndi I ji Onwe-gi ṅuru iyi, I we gwa ha okwu, si, M'gēme ka nkpuru-unu ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, ala nka nile kwa nke M'kwuworo okwu bayere ya, M'gēnye nkpuru-gi ya, ha gēketa kwa ya rue mb͕e ebighi-ebi.

14. Jehova we chegharia uche bayere ihe ọjọ nke O kwuru, si na Ọ gēme ndi-Ya.

15. Moses we chigharia, si n'ugwu ahu rida, mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n'aka-ya; bú mbadamba nkume nke edere ihe n'iru ha abua; n'otù iru na n'iru nke-ọzọ ka edeworo ihe n'elu nkume ahu.

Ọpupu 32