Ọpupu 32:30-35 Bible Nso (IGBOB)

30. O rue, n'echi-ya, na Moses siri ndi Israel, Unu onwe-unu emehiewo nmehie uku: ma ub͕u a m'gārigokuru Jehova; eleghi anya m'gēkpuchi nmehie-unu.

31. Moses we jeghachikuru Jehova, si, Biko, ndi nka emehiewo nmehie uku, mere onwe-ha chi ọla-edo.

32. Ma ub͕u a, ọ buru na I gāb͕aghara nmehie-ha; ma ọ buru na I meghi ya, biko, hichapum n'akwukwọ-Gi nke I deworo.

33. Jehova we si Moses, Onye ọ bula nke mehieworo megidem, ya ka M'gēhi-chapu n'akwukwọm.

34. Ma ub͕u a, je, duru ndim rue ebe ahu nke M'gwaworo gi okwu bayere ya: le, mọ-ozim ganēje n'iru gi: ma n'ubọchi mb͕e M'nēleta, M'gēwere kwa nmehie-ha leta ha.

35. Jehova we tie ndi Israel ihe, n'ihi na ha mere nwa-ehi ahu, nke Eron mere.

Ọpupu 32