36. i gēsu kwa ufọdu nime ya ka ọ di irighiri, were ufọdu nime ya tiye n'iru ihe-àmà ahu n'ulo-ikwū nzute, ebe M'gēzute gi; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ gāburu unu.
37. Ma ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke i gēme, unu emerela onwe-unu nke di ka ya n'ọtùtù-ya: nsọ ka ọ gādiri gi n'ebe Jehova nọ.
38. Onye ọ bula nke gēme nke di ka ya, inu ísì-ya, agēbipu kwa ya n'etiti umu-nna-ya.