32. Ọ bughi n'anu-aru madu ka agāwukwasi ya, unu eme-kwa-la nke di ka ya n'ọtùtù-ya: nsọ ka ọ di, nsọ ka ọ gādiri unu.
33. Onye ọ bula nke gāsugwa nke di ka ya, ma-ọbu onye ọ bula nke gēwere ufọdu nime ya tiye n'aru onye ala ọzọ, agēbipu ya n'etiti umu-nna-ya.
34. Jehova we si Moses, Chiri n'onwe-gi uda utọ di iche iche, stacte, na onycha, na galbanum; bú uda utọ, ha na frankincense anāgwaghi agwa: ha gāra n'ọtùtù;