1. Nka bu kwa ihe i gēme ha ido ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: were otù nwa-oke-ehi na ebulu abua nke zuru okè,
2. na achicha ekoghieko, na ob͕e achicha ufọdu ekoghieko nke agwara manu, na mbadamba-achicha ufọdu ekoghi-eko nke etere manu: utu flour nke ọka wheat ka i gēwere me ha.
3. I gētiye ha n'otù nkata, bute ha nso nime nkata ahu, ha na oke-ehi ahu na ebulu abua ahu.
4. Eron na umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute, i gēwere miri sa ha aru.