9. I gējikọta kwa ákwà-nkwuba ise iche, na ákwà-nkwuba isi iche, piaji ákwà-nkwuba nke-isi n'ebe iru ulo-ikwū di.
10. I gēme kwa ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba ahu dipuru adipu nime njikọta ahu, me kwa ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke abua.
11. I gēme kwa ọgu nko ọla abua na iri, me ka nko ahu ba n'anya-nko ahu, i we jikọta ulo-ikwū ahu, ọ we buru otù.
12. Ma nkwupu nke fọduru nime ákwà-nkwuba nke ulo-ikwū ahu, bú nkera ákwà-nkwuba nke fọduru, gākwupu n'azu ebe-obibi ahu.
13. Cubit ahu nke di n'otù akuku, na cubit ahu nke di n'akuku nke-ọzọ, nime nke fọduru n'ogologo nke ákwà-nkwuba nke ulo-ikwū, ọ gākwupu n'akuku abua nke ebe-obibi ahu, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ikpuchi ya.
14. I gēme-kwa-ra ulo-ikwū ahu ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, ya na ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya.
15. I gēme-kwa-ra ebe-obibi ahu ibo osisi acacia, nke nēguzo ọtọ.
16. Cubit iri ka ogologo nke otù ibo gādi, otù cubit na nkera cubit ka obosara nke otù ibo gādi kwa.
17. Otù ibo gēnwe ihe-nhiọye abua, nke ekwukọtara, otù na ibe-ya: otú a ka i gēmere ibo nile nke ebe-obibi ahu.
18. I gēme-kwa-ra ebe-obibi ahu ibo ahu, orú ibo i gēmere akuku Ndida chere iru na Ndida.
19. Ọgu ukwu ọla-ọcha abua ka i gēme kwa n'okpuru orú ibo ahu; ukwu abua n'okpuru otù ibo inara ihe-nhiọye-ya abua, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ inara ihe-nhiọye-ya abua.
20. I gēme-kwa-ra akuku nke-abua nke ebe-obibi ahu, bú akuku Ugwu, orú ibo:
21. na ọgu ukwu ọla-ọcha ha abua; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.