Ọpupu 25:36-40 Bible Nso (IGBOB)

36. Isi-ha alaka-ha gēsite na ya; ihe-idọba-oriọna ahu nile gābu otù ihe eji ọla-edo nke anāgwaghi agwa kpu.

37. I gēme kwa oriọna-ya, ha gādi asa: ha gēweli kwa oriọna-ya nile, ka ọ we nye ìhè na ncherita-iru ya.

38. Nkpa-ya nile na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile gābu ọla-edo anāgwaghi agwa.

39. Otù talent nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka agēji ma ya, ya na ihe ndia nile.

40. Ma le anya ka i me ha dika ihe-atù-ha si di, nke anēme ka gi onwe-gi hu n'ugwu a.

Ọpupu 25