13. I gēme kwa nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla-edo.
14. I gēme kwa ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku ib͕e ahu, iwere ha nēbu ib͕e ahu.
15. Nime nb͕a-aka nke ib͕e ahu ka nkpa-n'aka ahu ganādi: agaghi-ewepu ha nime ya.
16. I gētiye kwa n'ib͕e ahu ihe-àmà M'gēnye gi.
17. I gēme kwa ebe-nkpuchi-nmehie nke ọla-edo anāgwaghi agwa: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi.
18. I gēme kwa cherubim ọla-edo abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha, na nsọtu abua nke ebe-nkpuchi-nmehie.
19. Gi me otù cherub n'otù nsọtu, na otù cherub na nsọtu nke-ọzọ: site n'ebe-nkpuchi-nmehie ka unu gēme cherubim ahu n'elu nsọtu-ya abua.
20. Cherubim ahu ganāb͕asa kwa nkù-ha n'elu, nēkpuchi ebe-nkpuchi-nmehie na nkù-ha, iru-ha nēcherita kwa onwe-ha; n'ebe ebe-nkpuchi-nmehie di ka iru cherubim ahu gādi.
21. I gātukwasi kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n'ib͕e ahu, n'elu ya; nime ib͕e ahu ka i gētiye ihe-àmà nke M'gēnye gi.
22. M'gēzute kwa gi n'ebe ahu, kpayere gi uka site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, site n'etiti cherubim abua nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, bayere ihe nile nke M'gēnye gi n'iwu n'ebe umu Israel nọ.
23. I gēme kwa table osisi acacia: cubit abua ka ogologo-ya gādi, otù cubit ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi.