Ọpupu 23:8-12 Bible Nso (IGBOB)

8. Anara-kwa-la ihe-iri-ngo: n'ihi na ihe-iri-ngo nēme ka ndi nāhu uzọ kpu ìsì, ọ nēme kwa ka okwu ndi ezi omume b͕agọ ab͕agọ.

9. Emeb͕u-kwa-la ọbìa: n'ihi na unu onwe-unu amawo nkpuru-obi nke ọbìa, n'ihi na ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.

10. Arọ isi ka i gāgha nkpuru n'ala-gi, chikọta kwa ihe-ọmume-ya:

11. ma n'arọ nke-asa i gārapu ya, me ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; ka ndi-ob͕eye nke ndi-gi we rie ihe: anu-ọhia gēri kwa ihe ha rifọrọ. Otú a ka i gēme kwa ubi-vine-gi, me kwa ubi-olive-gi.

12. Ubọchi isi ka i gālu ọlu-gi, ma n'ubọchi nke-asa i gākwusi n'ọlu: ka ehi-gi na inyinya-ibu-gi we zuru ike, ọzọ, ka nwa nke orù-gi nwayi na ọbìa we turu ndu.

Ọpupu 23