Ọpupu 22:27-31 Bible Nso (IGBOB)

27. n'ihi na nke ahu bu ihe-nb͕okwasi o nwere nání ya, nke ahu bu uwe-nb͕okwasi-ya iyikwasi n'akpukpọ-aru-ya: ọ̀ bu nime gini ka o gēdina? o gēru kwa, mb͕e ọ nētikum, na M'gānu; n'ihi na onye-amara ka M'bu.

28. Gi akọchala Chineke, abu-kwa-la onye-isi ndi-gi ọnu.

29. Alala azú inye ùjú-gi na ihe-ọṅuṅu-gi. Nwa-nwoke eburu uzọ mu nime umu-gi ndikom ka i gēnyem.

30. Otú a ka i gēmere ehi-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi: ubọchi asa ka ya na nne-ya gānọ: n'ubọchi nke-asatọ i gēwere ya nyem.

31. Ndi di nsọ ka unu gāburum: unu eri-kwa-la anu nke anu-ọhia dọb͕uru n'ọhia; nkita ka unu gātudara ya.

Ọpupu 22