Ọpupu 19:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. Moses we rigokuru Chineke, Jehova we si n'ugwu ahu kpọ ya òkù, si, Otú a ka i gāsi ulo Jekob, gosi kwa umu Israel;

4. Unu onwe-unu ahuwo ihe M'mere ndi Ijipt, ebu-kwa-ram unu n'elu nkù ugo, me ka unu biakutem.

5. Ma ub͕u a, ọ buru na unu ege nti n'olum n'ezie, ọ buru kwa na unu edebe ọb͕ub͕a-ndum, unu gābu-kwa-ram ihe nke akam kari ndi nile: n'ihi na ọ bu Mu nwe uwa nile:

6. unu onwe-unu gābu-kwa-ram ala-eze ndi-nchu-àjà, na mba di nsọ. Ndia bu okwu nke i gāgwa umu Israel.

7. Moses we bia, kpọ ndi-okenye ndi Israel, tiye okwu ndia nile n'iru ha, bú nke Jehova nyere ya n'iwu.

8. Ndi Israel nile we za n'otù, si, Ihe nile Jehova kwuru, ayi gēme ya. Moses we weghachiri Jehova okwu nile nke ndi ahu.

Ọpupu 19