10. I were ifufe-Gi fe, oké osimiri kpuchiri ha:Ha mikpuru dika opù nime miri di ebube.
11. Ònye di ka Gi n'etiti chi nile, Jehova?Ònye di ka Gi, di ebube n'idi-nsọ?Onye anātu egwu n'otuto nile, nēme ihe-ebube di iche iche.
12. I setiri aka-nri-Gi,Ala elo ha.
13. N'ebere-Gi ka I duworo ndi nke I b͕aputaworo:N'ike-Gi ka I duworo ha nwayọ rue ebe-obibi-Gi di nsọ.
14. Ndi ọzọ anuwo, ha ama jijiji:Ihe-nb͕u eb͕uwo ndi bi na Filistia.
15. Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri:Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha:Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo.