Ọpupu 13:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Dorom nwa ọ bula eburu uzọ mu nsọ, bú nwa meghere àkpà-nwa ọ bula n'etiti umu Israel, ma n'etiti madu ma n'etiti anumanu: nkem ka ọ bu.

3. Moses we si ndi Israel, Cheta ubọchi a, nke ọ bu nime ya ka unu siworo n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta; n'ihi na ike nke aka ka Jehova ji me ka unu si n'ebe a puta: agaghi-eri kwa achicha koro eko.

Ọpupu 13