19. Ubọchi asa ka anāgaghi-ahu ihe nēko achicha n'ulo nile unu: n'ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko, agēbipu madu ahu nime nzukọ Israel, ma n'etiti ndi-ọbìa, ma n'etiti ndi amuru n'ala.
20. Unu agaghi-eri achicha ọ bula koro eko; n'ebe-obibi-unu nile ka unu gēri achicha ekoghi-eko.
21. Moses we kpọ ndi-okenye nile nke Israel, si ha, Kpuputanu, chiri kwa ìgwè ewu na aturu n'onwe-unu, dika ab͕uru-unu nile si di, b͕u-kwa-nu anu ngabiga nka.
22. Unu gēwere kwa ùkwù hyssop, sue ya n'ọbara nke di n'ọkwa, were ya jua ọbara ufọdu nke di n'ọkwa elu-uzọ na n'awara-uzọ abua; unu onwe-unu agaghi-apu kwa, onye ọ bula n'ọnu-uzọ ulo-ya, rue ututu.
23. N'ihi na Jehova gāgabiga iti ndi Ijipt ihe; ma mb͕e Ọ huru ọbara ahu n'elu elu-uzọ na n'elu awara-uzọ abua, Jehova gāgabiga ọnu-uzọ ahu, Ọ gaghi-ekwe onye-nbibì ahu ka ọ ba n'ulo-unu iti unu ihe.
24. Unu gēdebe kwa ihe a ka ọ buru ukpuru n'ebe i nọ na n'ebe umu-gi nọ rue mb͕e ebighi-ebi.
25. O gēru kwa, mb͕e unu gābà n'ala ahu nke Jehova gēnye unu, dika O kwuworo, na unu gēdebe òfùfè a.
26. O gēru kwa, mb͕e umu-unu gāsi unu, Gini bu òfùfè a unu nwere?
27. na unu gāsi, Àjà ngabiga ka ọ bu nke anāchuru Jehova, Onye gabigara ulo nile nke umu Israel n'Ijipt, mb͕e O tiri ndi Ijipt ihe, O we naputa ulo nile ayi. Ndi Israel we rube isi, kpọ isi ala.
28. Umu Israel we je me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere.
29. O rue, n'etiti abali, na Jehova tib͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke nānọkwasi n'oche-eze-ya rue nwa eburu uzọ muru onye adọtara n'agha nke nọ n'ulo olùlù; O tib͕u-kwa-ra nwa anumanu ọ bula eburu uzọ mu.