Ọpupu 10:9-25 Bible Nso (IGBOB)

9. Moses we si, Ayi na umu ntà ayi na ndi-agadi-ayi gāyikọ je, ayi na umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom na ìgwè ewu na aturu-ayi na ìgwè ehi-ayi gāyikọ je; n'ihi na ememe Jehova ka ayi nwere.

10. Ọ si ha, Ka Jehova diyere unu otú a, dika m'gēzipu unu na umu-ntakiri-unu: lenu anya, n'ihi na ihe ọjọ di n'iru unu.

11. Ọ gaghi-ndi otú a: biko, jenu, unu, bú ndikom, fè Jehova; n'ihi na nke ahu ka unu onwe-unu nāchọ. Ewe chupu ha n'iru Fero.

12. Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'elu ala Ijipt iweta igurube, ka ha we rigota n'elu ala Ijipt, rie-ihe-ọkukú ọ bula nke ala, bú ihe nile nke ákú-miri-ígwé ahu rapuru.

13. Moses we setipu nkpa-n'aka-ya n'elu ala Ijipt, Jehova we dubata ifufe Iru-anyanwu n'ala ahu ehihie ahu nile na abali ahu nile: mb͕e o ruru ututu ifufe Iru-anyanwu ahu butere igurube.

14. Igurube we rigota n'elu ala Ijipt nile, be n'ókè-ala ọ bula nke Ijipt: ha di arọ́ nke-uku; tutu ha ọ dighi igurube di otú a, dika igurube ahu, mb͕e ha gasiri ọ gaghi-adi kwa igurube otú a.

15. Ha we kpuchie iru ala ahu nile, ala we b͕a ọchichiri; ha we rie ihe-ọkukú nile ọ bula nke ala ahu, na nkpuru nile nke osisi nke ákú-miri-ígwé rapuru: ọ dighi kwa akwukwọ ndu fọduru, n'osisi ma-ọbu n'ihe-ọkukú nke ubi, n'ala Ijipt nile.

16. Fero we me ngwa ikpọ Moses na Eron, si, Eme-hiewom megide Jehova, bú Chineke-unu, megide kwa unu.

17. Ma ub͕u a, biko, gbaghara nmehiem nání otù ub͕ò a, riọ-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, ka Ọ we wezuga n'arum nání ọnwu a.

18. Ọ we si n'ebe Fero nọ pua, riọ Jehova aririọ.

19. Jehova we me ifufe Ọdida-anyanwu di ike nke-uku ka o chigharia, nke buru igurube, fere ha ga n'Oké Osimiri Uhie; ọ dighi otù igurube fọduru n'ókè-ala ọ bula nke Ijipt.

20. Ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel.

21. Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'iru elu-igwe, ka ọchichiri we b͕a n'elu ala Ijipt, bú ọchichiri agēbitu aka.

22. Moses we setipu aka-ya n'iru elu-igwe; oké ọchichiri we di n'ala Ijipt nile ubọchi atọ;

23. ha ahuritaghi ibe-ha anya, ọ dighi kwa onye si n'ebe ọ nọ bilie ubọchi atọ: ma umu Israel nile nwere ìhè n'ebe-obibi nile ha.

24. Fero we kpọ Moses, si, Jenu, fè Jehova; nání ìgwè ewu na aturu-unu na ìgwè ehi-unu ka agēdebe: ka umu-ntakiri-unu so kwa unu je.

25. Moses we si, Gi onwe-gi gēnye kwa n'aka-ayi ihe àjà, na ihe àjà-nsure-ọku, ka ayi we mere Jehova, bú Chineke-ayi, ihe.

Ọpupu 10