Ọpupu 10:22-27 Bible Nso (IGBOB)

22. Moses we setipu aka-ya n'iru elu-igwe; oké ọchichiri we di n'ala Ijipt nile ubọchi atọ;

23. ha ahuritaghi ibe-ha anya, ọ dighi kwa onye si n'ebe ọ nọ bilie ubọchi atọ: ma umu Israel nile nwere ìhè n'ebe-obibi nile ha.

24. Fero we kpọ Moses, si, Jenu, fè Jehova; nání ìgwè ewu na aturu-unu na ìgwè ehi-unu ka agēdebe: ka umu-ntakiri-unu so kwa unu je.

25. Moses we si, Gi onwe-gi gēnye kwa n'aka-ayi ihe àjà, na ihe àjà-nsure-ọku, ka ayi we mere Jehova, bú Chineke-ayi, ihe.

26. Ọzọ kwa, anu-ulo-ayi gēso ayi je; agaghi-arapu otù ukwu anu; n'ihi na ufọdu nime ha ka ayi gēwere fè Jehova, bú Chineke-ayi; ma ayi onwe-ayi amaghi ihe ayi gēji fè Jehova, rue mb͕e ayi gābia rue ebe ahu.

27. Ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o kweghi kwa izipu ha.

Ọpupu 10