15. Eze Ijipt we si ndinyom Hibru ndi nēle ime, ndi aha otù onye nime ha bu Shifra, aha nke onye nke-abua bu kwa Pua:
16. ọ si, Mb͕e unu nēle ime ndinyom Hibru, we hu ha n'elu oche ọmumu-nwa; ọ buru na nwa-nwoke ka ọ bu, unu gēme kwa ka ọ nwua; ma ọ buru na nwa-nwayi ka ọ bu, ọ gādi kwa ndu.
17. Ma ndinyom nke nēle ime nātu egwu Chineke, ha emeghi kwa dika eze Ijipt gwara ha, ma ha debere umu-ndikom ndu.
18. Eze Ijipt we kpọ ndinyom ahu nēle ime, ọ si ha, Gini mere unu ji me ihe a, we debe umu-ndikom ndu?