1. Ma ndia bu aha umu-ndikom Israel, ndi batara n'Ijipt; ha soro Jekob bata, nwoke ọ bula na ulo-ya.
2. Reuben, na Simeon, na Livai, na Juda;
3. Isaka, na Zebulun, na Benjamin;
4. Dan, na Naftali, na Gad, na Asha.
5. Madu nile ndi si n'úkwù Jekob puta di kwa ọgu madu atọ na iri: ma Josef, ọ nọri n'Ijipt.
6. Josef we nwua, ya na umu-nne-ya nile, na ọb͕ọ ahu nile.