8. Ma obodo nile ahu nke unu gēnye site n'ihe-onwunwe nke umu Israel, n'aka ndi bara uba ka unu gānara ọtutu obodo; ma n'aka ndi di ole-na-ole ka unu gānara obodo ole-na-ole: ọ bu dika ala-nketa-ya si di, nke ha nēketa, ka onye ọ bula gēnye ndi Livai site n'obodo-ya nile.
9. Jehova we gwa Moses okwu, si,
10. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu onwe-unu ganāgabiga Jọdan ba n'ala Kenean,
11. unu gārọputa-kwa-ra onwe-unu obodo ufọdu, obodo nb͕aba ka ha gāburu unu; ka ob͕u-madu onye nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu.
12. Obodo nile ahu gābu-kwa-ra unu ebe-nb͕abà agēsi n'aka onye-ọ́bọ̀ b͕alaga; ka ob͕u-madu we ghara inwu, rue mb͕e ọ gēguzo n'iru nzukọm ka ekpe ya ikpe.
13. Obodo ndia nke unu gēnye, obodo isi nke nb͕abá ka ha gāburu unu.
14. Obodo atọ ka unu gēnye n'ofè Jọdan nka, obodo atọ ka unu gēnye kwa n'ala Kenean; obodo nb͕abá ka ha gābu.
15. Obodo isi ndia gāburu umu Israel, buru kwa ọbìa, buru kwa onye bi n'etiti ha, ebe-nb͕abà: ka onye ọ bula nke nētib͕u madu n'ọghọm we b͕alaga n'ebe ahu.
16. Ma ọ buru na ọ were ihe ígwè tie ya, ọ we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.
17. Ọ buru kwa na o were nkume di ya n'aka, bú nke gēme ka madu nwua, tie ya, o we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.
18. Ma ọ buru na o were ihe osisi di ya n'aka, bú nke gēme ka madu nwua, tie ya, o we nwua, ob͕u-madu ka ọ bu: aghaghi ime ka ob͕u-madu ahu nwua.
19. Onye-ọ́bọ̀ ọbara, ya onwe-ya gēme ka ob͕u-madu ahu nwua: mb͕e o zutere ya, ya onwe-ya gēme ka ọ nwua.
20. Ọ buru kwa na ọ kwatue ya n'ikpọ-asì, ma-ọbu tua ya ihe, mb͕e o nēche anwu, o we nwua;
21. ma-ọbu asi na o were aka-ya tie ya n'iro, o we nwua; aghaghi ime ka onye nētib͕u ya nwua; ob͕u-madu ka ọ bu: onye-ọ́bọ̀, ọbara gēme ka ob͕u-madu ahu nwua, mb͕e o zutere ya.
22. Ma ọ buru na ọ bu na mberede ka ọ kwaturu ya, mb͕e ọ nādighi n'iro, ma-ọbu tua ya ihe ọ bula, mb͕e ọ nēcheghi anwu,