23. ma-ọbu asi na o were nkume ọ bula, bú nke gēme ka madu nwua, me ka ọ dakwasi ya, mb͕e ọ nāhughi ya, o we nwua, ma onye ahu abughi onye-iro-ya, ọ bughi kwa onye nāchọ ime ya ihe ọjọ:
24. nzukọm gēkpe kwa n'etiti oti-ihe ahu na onye-ọ́bọ̀ ọbara dika ikpé ndia si di:
25. nzukọm gānaputa kwa ob͕u-madu ahu n'aka onye-ọ́bọ̀ ọbara, nzukọm gēme kwa ka ọ laghachi n'obodo nb͕abà ya, ebe ọ b͕alagara: o gēbi kwa nime ya rue mb͕e ọnwu onye-isi-nchu-àjà, nke ewere manu nsọ ahu te.
26. Ma ọ buru na ob͕u-madu ahu esi n'ókè-ala obodo nb͕abà ya pua ma-ọli, bú ebe ọ b͕alagara;
27. onye-ọ́bọ̀ ọbara ewe huta ya n'azu ókè-ala abodo nb͕abà ya, onye-ọ́bọ̀ ọbara ahu we b͕ue ob͕u-madu ahu, ọ dighi ikpe ọbara mara ya: