1. Jehova we gwa Moses okwu n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko, si,
2. Nye umu Israel iwu, ka ha si n'ihe-nketa nke ihe-onwunwe-ha nye ndi Livai obodo ibi nime ha; ebe-ita-nri nke obodo ahu gēnwe buruburu ha ka unu gēnye kwa ndi Livai.
3. Obodo ahu gābu-kwa-ra ha ebe ibi nime ha; ebe-ita-nri-ha gādi-kwa-ra anu-ulo-ha, di-kwa-ra àkù-ha, di-kwa-ra anu nile ha.
4. Ebe-ita-nri nke obodo nile, nke unu gēnye ndi Livai, gādi nnù cubit abua na ọgu iri site na mb͕idi obodo we gaba n'azu-ya buruburu.
5. Unu gātu kwa n'azu obodo akuku Iru anyanwu, nnù cubit ise, na akuku Ndida, nnù cubit ise, na akuku Ọdida-anyanwu, nnù cubit ise, na akuku Ugwu cubit ise, obodo gābi kwa n'etiti. Nka gāburu ha ebe-ita-nri nke obodo-ha.
6. Obodo nile nke unu gēnye ndi Livai, ha gābu obodo isi nke nb͕abà, nke unu gēnye ka ob͕u-madu we b͕alaga n'ebe ahu: unu genye kwa ọgu obodo abua na abua tiyere ha.
7. Obodo nile nke unu gēnye ndi Livai bu ọgu obodo abua na asatọ ha na ebe-ita-nri-ha.