Ọnu-Ọgugu 34:17-22 Bible Nso (IGBOB)

17. Ndia bu aha ndikom ahu ndi gēme ka unu keta ala ahu: Eleeza, bú onye nchu-àjà, na Joshua nwa Nun.

18. Ọ bu kwa otù onye-isi otù onye-isi site n'ebo ọ bula ka unu gēkuru, ime ka eketa ala ahu.

19. Ndia bu aha ndikom ahu: nke ebo Juda, Keleb nwa Jefune.

20. Nke ebo umu Simeon, Shemuel nwa Amihud.

21. Nke ebo Benjamin, Elidad nwa Kislon.

22. Nke ebo umu Dan otù onye-isi kwa, bú Biku nwa Jọgli.

Ọnu-Ọgugu 34