40. Onye Kenean ahu, bú eze Arad, onye bi na Negeb n'ala Kenean, we nu na umu Israel abiawo.
41. Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Zalmona.
42. Ha si na Zalmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Punon.
43. Ha si na Punon bulie, ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot.
44. Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ókè-ala Moab.
45. Ha si n'Iyim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dibon-gad.
46. Ha si na Dibon-gad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Almon-diblataim.
47. Ha si n'Almon-diblataim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Abarim, n'iru Nebo.
48. Ha si n'ugwu Abarim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ala ihe nādighi nke Moab, n'akuku Jọdan na nso Jeriko.