Ọnu-Ọgugu 33:40-48 Bible Nso (IGBOB)

40. Onye Kenean ahu, bú eze Arad, onye bi na Negeb n'ala Kenean, we nu na umu Israel abiawo.

41. Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Zalmona.

42. Ha si na Zalmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Punon.

43. Ha si na Punon bulie, ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot.

44. Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ókè-ala Moab.

45. Ha si n'Iyim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dibon-gad.

46. Ha si na Dibon-gad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Almon-diblataim.

47. Ha si n'Almon-diblataim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Abarim, n'iru Nebo.

48. Ha si n'ugwu Abarim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ala ihe nādighi nke Moab, n'akuku Jọdan na nso Jeriko.

Ọnu-Ọgugu 33