Ọnu-Ọgugu 33:33-39 Bible Nso (IGBOB)

33. Ha si na Hoa-hagidgad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Jọtbata.

34. Ha si na Jọtbata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Abrona.

35. Ha si n'Abrona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Ezion-geba.

36. Ha si n'Ezion-geba bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Zin (nke ahu bu Kedesh).

37. Ha si na Kedesh bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Hoa, na nsọtu ala Edom.

38. Eron, bú onye-nchu-àjà, we rigo n'ugwu Hoa n'okwu ọnu Jehova, nwua n'ebe ahu, n'arọ nke-ọgu-abua site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt puta, n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu.

39. Eron we b͕a ọgu arọ isi na atọ mb͕e ọ nwuru n'ugwu Hoa.

Ọnu-Ọgugu 33