Ọnu-Ọgugu 33:29-48 Bible Nso (IGBOB)

29. Ha si na Mitka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hashmona.

30. Ha si na Hashmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Mosirot.

31. Ha si na Mosirot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Beni-jaakan.

32. Ha si na Beni-jaakan bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hoa-hagidgad.

33. Ha si na Hoa-hagidgad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Jọtbata.

34. Ha si na Jọtbata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Abrona.

35. Ha si n'Abrona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Ezion-geba.

36. Ha si n'Ezion-geba bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Zin (nke ahu bu Kedesh).

37. Ha si na Kedesh bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Hoa, na nsọtu ala Edom.

38. Eron, bú onye-nchu-àjà, we rigo n'ugwu Hoa n'okwu ọnu Jehova, nwua n'ebe ahu, n'arọ nke-ọgu-abua site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt puta, n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu.

39. Eron we b͕a ọgu arọ isi na atọ mb͕e ọ nwuru n'ugwu Hoa.

40. Onye Kenean ahu, bú eze Arad, onye bi na Negeb n'ala Kenean, we nu na umu Israel abiawo.

41. Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Zalmona.

42. Ha si na Zalmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Punon.

43. Ha si na Punon bulie, ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot.

44. Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ókè-ala Moab.

45. Ha si n'Iyim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dibon-gad.

46. Ha si na Dibon-gad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Almon-diblataim.

47. Ha si n'Almon-diblataim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Abarim, n'iru Nebo.

48. Ha si n'ugwu Abarim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ala ihe nādighi nke Moab, n'akuku Jọdan na nso Jeriko.

Ọnu-Ọgugu 33