26. Ha si na Makhilot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Tahat.
27. Ha si na Tahat bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Tera.
28. Ha si na Tera bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Mitka.
29. Ha si na Mitka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hashmona.
30. Ha si na Hashmona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Mosirot.
31. Ha si na Mosirot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Beni-jaakan.
32. Ha si na Beni-jaakan bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Hoa-hagidgad.
33. Ha si na Hoa-hagidgad bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Jọtbata.
34. Ha si na Jọtbata bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Abrona.
35. Ha si n'Abrona bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Ezion-geba.
36. Ha si n'Ezion-geba bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Zin (nke ahu bu Kedesh).
37. Ha si na Kedesh bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ugwu Hoa, na nsọtu ala Edom.
38. Eron, bú onye-nchu-àjà, we rigo n'ugwu Hoa n'okwu ọnu Jehova, nwua n'ebe ahu, n'arọ nke-ọgu-abua site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt puta, n'ọnwa nke-ise, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu.
39. Eron we b͕a ọgu arọ isi na atọ mb͕e ọ nwuru n'ugwu Hoa.