20. Moses we si ha, Ọ buru na unu eme ihe a; ọ buru na unu ejikere onwe-unu n'iru Jehova ibu agha,
21. ọ buru kwa na onye ọ bula nime unu nke ejikere agabiga Jọdan n'iru Jehova, rue mb͕e Ọ gānapu ndi-iro-Ya ala-ha n'iru Ya,
22. ewe buda ala ahu n'iru Jehova: emesi kwa unu gālata, we buru ndi ikpe nāmaghi site n'aka Jehova, site kwa n'aka Israel; ala nka ewe buru unu ihe-onwunwe n'iru Jehova.
23. Ma ọ buru na unu emeghi otú a, le, unu emehiewo megide Jehova: mara-kwa-nu nmehie-unu, na ọ gāchọputa unu.