1. Ma umu Reuben na umu Gad nwere ọtutu anu-ulo, ha riri nne nke-uku: ha we hu ala Jeza, na ala Gilead, ma, le, ebe ahu bu ebe anu-ulo;
2. umu Gad na umu Reuben we bia, gwa Moses, gwa kwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gwa kwa ndi-isi nzukọ Israel, okwu, si,
3. Atarot, na Dibon, na Jeza, na Nimra, na Heshbon, na Eleale, na Seban, na Nebo, na Beon,