31. Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we me dika Jehova nyere Moses iwu.
32. Ma ihe-nweta ahu, bú ihe fọduru n'ihe-nluta nke ndi usu-ndi agha lutara n'agha, bu orú nnù aturu ọgu uzọ anọ na uzọ anọ, na nnù asa, na ọgu iri,
33. ehi di kwa orú nnù uzọ iteghete;
34. inyinya-ibu di kwa orú nnù uzọ asa, na nnù iri-na-abua, na ọgu iri;
35. madu kwa, bú ndinyom ndi nāmaghi ndina nwoke, madu nile di orú nnù uzọ anọ.
36. Nkera ahu, nke bu òkè nke ndi nāpu ba n'usu-ndi-agha, we di n'ọnu-ọgugu ìgwè ewu na aturu orú nnù ọgu uzọ abua na uzọ abua, na nnù atọ, na ọgu iri-na-ise: