12. Ha we wetara Moses, weta-kwa-ra Eleeza, bú onye-nchu-àjà, weta-kwa-ra nzukọ umu Israel, ndi adọtara n'agha, na ihe-nweta, na ihe akwatara n'agha, rue ọmuma-ulo-ikwū, rue ala ihe nādighi nke Moab nke di n'akuku Jọdan na nso Jeriko.
13. Moses, na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi nile nke nzukọ Israel, we pua izute ha n'azu ọmuma-ulo-ikwū.
14. Moses we wesa ndi-nlekọta usu-ndi-agha ahu iwe, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi nēsi n'usu-ndi-agha nke agha ahu bia.
15. Moss we si ha, Ùnu emewo ka ndinyom nile di ndu?