1. Jehova we gwa Moses okwu, si,
2. Bọrọ umu Israel ọ́bọ̀ n'aru ndi Mdian: emesia agāchikọta gi na umu-nna-gi n'ala-mọ.
3. Moses we gwa ndi Israel okwu, si, Sinu n'etiti onwe-unu jikere n'onwe-unu ndikom isoro usu-ndi-agha, ka ha we megide Midian, ibọkwasi Midian ọ́bọ̀ Jehova.
4. Nnù ndikom abua na ọgu iri n'ebo n'ebo, n'ebo nile nke Israel, ka unu gēzigara usu-ndi-gha ahu.
5. Ewe si n'usu nnù abua na ọgu iri nile nke Israel rara nnù ndikom abua na ọgu iri nke ebo ọ bula nye, orú nnù na nnù iri ejikere iso usu-ndi-agha ahu.
6. Moses we ziga ha, nnù ndikom abua na ọgu iri nke ebo ọ bula, isoro usu-ndi-agha, ha na Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, isoro usu-ndi-agha, ihe nile nke ebe nsọ Chineke na opì abua ọ gāfù idasi uda ike di kwa n'aka-ya.
7. Ha we buso Midian agha, dika Jehova nyere Moses iwu; ha we b͕ue nwoke nile ọ bula.