Ọnu-Ọgugu 30:10-13 Bible Nso (IGBOB)

10. Ma ọ buru na ọ bu n'ulo di-ya ka o kwere nkwa, ma-ọbu were isọ-nsọ ke nkpuru-obi-ya ab͕u n'iṅu-iyi,

11. di-ya we nu ya, ma ọ b͕ara ya nkiti, ọ sighi kwa ya, É-è; nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u gēguzosi kwa ike.

12. Ma ọ buru na di-ya emebisia ha n'ubọchi ọ nuru ha; ihe ọ bula nke nēsi n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya puta bayere nkwa-ya nile, ma-ọbu nke bayere isọ-nsọ nke nkpuru-obi-ya, ọ gaghi-eguzosi ike: di-ya emebiwo ha; Jehova gāb͕aghara kwa ya.

13. Nkwa ọ bula, na iyi isọ-nsọ ọ bula iji weda nkpuru-obi n'ala, di-ya gēme ka o guzosi ike, ma-ọbu di-ya gēmebi ya.

Ọnu-Ọgugu 30