16. Ọzọ, n'ọwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa, ka ngabiga nke diri Jehova gādi.
17. N'ubọchi nke iri-na-ise nke ọnwa ahu ka ememe gādi: ubọchi asa ka agēri achicha ekoghi-eko.
18. N'ubọchi mbu nkpọkọta nsọ gādi; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje:
19. ma unu gēweta nso àjà-ọku, bú àjà nsure-ọku anēsurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ: nke zuru okè ka ha gāburu unu:
20. na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu: uzọ atọ n'uzọ iri ka unu gāchu bayere otù oke-ehi, ọ bu kwa uzọ abua n'uzọ iri ka unu gāchu bayere ebulu ahu;
21. ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, ka unu gāchu bayere nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu;