Ọnu-Ọgugu 28:12-26 Bible Nso (IGBOB)

12. na uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu oke-ehi ọ bula; na uzọ abua n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu otù ebulu;

13. na otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, nke otù ephah utu ọka flour, bú onyinye-inata-iru-ọma, nke agwara manu, iji chu nwa-aturu ọ bula; ọ bu àjà-nsure-ọku, ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.

14. Àjà-ihe-ọṅuṅu-ha gābu kwa nkera otù hin manya-vine iji chu otú oke-ehi, na otú uzọ n'uzọ atọ nke hin iji chu ebulu ahu, na otù uzọ n'uzọ anọ nke hin iji chu otù nwa-aturu: nka bu àjà-nsure-ọku ọnwa kwa-ọnwa anēsure n'ọnwa nile nke arọ.

15. Otù nkpi kwa iji chu àjà-nmehie nye Jehova; agāchu ya tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà-ihe-ọṅuṅu-ya.

16. Ọzọ, n'ọwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa, ka ngabiga nke diri Jehova gādi.

17. N'ubọchi nke iri-na-ise nke ọnwa ahu ka ememe gādi: ubọchi asa ka agēri achicha ekoghi-eko.

18. N'ubọchi mbu nkpọkọta nsọ gādi; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje:

19. ma unu gēweta nso àjà-ọku, bú àjà nsure-ọku anēsurere Jehova; umu-oke-ehi abua, na otù ebulu, na umu-aturu asa nke b͕ara otù arọ: nke zuru okè ka ha gāburu unu:

20. na onyinye-inata-iru-ọma-ha, bú utu ọka flour agwara manu: uzọ atọ n'uzọ iri ka unu gāchu bayere otù oke-ehi, ọ bu kwa uzọ abua n'uzọ iri ka unu gāchu bayere ebulu ahu;

21. ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ iri, otù uzọ n'uzọ iri, ka unu gāchu bayere nwa-aturu ọ bula nime umu-aturu asa ahu;

22. na otù nkpi iji chu àjà-nmehie, ikpuchiri unu nmehie-unu.

23. Unu gāchu ndia nāgughi àjà-nsure-ọku ututu, nke bu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum.

24. Dika ihe ndia si di ka unu ganāchu kwa-ubọchi, ubọchi asa, nri nke àjà-ọku, nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova: agāchu ya tiyere àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na àjà ihe-ọṅuṅu-ya.

25. N'ubọchi nke-asa nkpọkọta nsọ gādi-kwa-ra unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje.

26. Ọzọ, n'ubọchi nkpuru mbu, mb͕e unu nēweta nso Jehova onyinye-inata-iru-ọma ọhu n'ememe izú asa nke ubọchi asa unu, nkpọkọta nsọ gādiri unu; ọ dighi ozi ọ bula nke òfufè unu gēje:

Ọnu-Ọgugu 28