Ọnu-Ọgugu 24:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma mb͕e Belam huru na ọ di nma n'anya Jehova igọzi Israel, ọ jeghi, dika o si eje ub͕ò ub͕ò, izute ọb͕ub͕a-afa di iche iche, ma o chere iru-ya n'ọzara.

2. Belam we welie anya-ya abua, hu Israel ka ha nānọ n'ulo-ikwū-ha dika ebo nile ha si di; Mọ nke Chineke we dikwasi ya.

3. Ọ we tua ilu-ya, si,Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta,Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:

4. Ihe nke si n'ọnu-ya puta, bú onye nānu okwu-ọnu nile nke Chineke,Onye nāhu ọhù nke Onye ahu Nke puru ime ihe nile,Mb͕e ọ nāda, ma anya-ya abua saghere asaghe:

5. Le ka ulo-ikwū-gi nile si ma nọ̄ nma, Jekob!Le ka ebe-obibi-gi nile si ma nọ̄ nma, Israel!

6. Dika ndagwurugwu di iche iche ka esetiworo ha,Dika ubi di iche iche ab͕ara ogige n'akuku osimiri,Dika osisi lign-aloes nke Jehova kuworo,Dika osisi cedar n'akuku miri.

Ọnu-Ọgugu 24