11. Nka bu kwa nke gi, àjà-nbuli nke onyinye-ha, ọbuná-àjà-ofufé nile nke umu Israel: gi ka M'nyeworo ha, nye kwa umu-gi ndikom, nye kwa umu-gi ndinyom, tiyere gi, n'ukpuru ebighi-ebi onye ọ bula nke di ọcha n'ulo-gi gēri ya.
12. Manu nile nke kachasi nma nke manu ọhu, na manya nile nke kachasi nma nke manya-vine ọhu, na ọka, bú ihe mbu ha nke ha nēnye Jehova, gi ka M'nyeworo ha.
13. Nkpuru mbu nke ihe nile di n'ala-ha, nke ha nēwetara Jehova, nke gi ka ọ bu; onye ọ bula nke di ọcha n'ulo-gi gēri ya.
14. Ihe ọ bula ewezugara ka ebibie ya n'Israel, nke gi ka ọ bu.
15. Nwa ọ bula nke meghere àkpà-nwa, nke anu-aru nile nke ha nēweta nso Jehova, n'etiti madu na n'etiti anu-ulo, ọ bu nke gi: nání i ghaghi ib͕aputa nwa madu buru uzọ mu, nwa anu-ulo ruru árú buru uzọ mu ka i gāb͕aputa kwa.