Ọnu-Ọgugu 17:10-13 Bible Nso (IGBOB)

10. Jehova we si Moses, Doghachi nkpa-n'aka Eron n'iru ihe-àmàm ka ọ buru ihe-ndebe, iburu umu nnupu-isi ihe-iriba-ama; ka i we me ka ntamu nile ha si n'ebe M'nọ bìsia, ka ha we ghara inwu.

11. Moses we me ya: dika Jehova nyere ya iwu, otú a ka ọ mere.

12. Umu Israel we gwa Moses okwu, si, Le, ayi ekubìwo, ayi alawo n'iyì, ayi nile alawo n'iyì.

13. Onye ọ bula nke nābiaru nso, nke nābiaru nso ebe-obibi Jehova, gānwu: ọ̀ bu na ayi agwusiwo n'ikubì ekubì?

Ọnu-Ọgugu 17