6. Ma-ọbu n'ichu ebulu n'àjà, i gēdozi onyinye-inata-iru-ọma, uzọ abua n'uzọ iri nke otù ephah utu ọku flour agwara n'otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin nke manu.
7. Manya-vine iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin, ka i gēweta kwa nso, ka ọ buru ihe ísì utọ isurere Jehova.
8. Ọzọ, mb͕e i nēme nwa-oke-ehi ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ma-ọbu àjà ọzọ, imezu nkwa, ma-ọbu ichu àjà-udo anāchuru Jehova:
9. ọ gēweta kwa nso, tiyere nwa-oke-ehi ahu, onyinye-inata-iru-ọma, bú uzọ atọ n'uzọ iri nke otù ephah utu ọka flour agwara na nkera hin nke manu.